Amos 5

Abụ akwa na ịkpọ oku maka nchegharị

1Nụrụnụ okwu ndị a, nke a ka m na-ekwu megide unu, ọ bụ mkpu akwa maka gị ezinaụlọ nke Izrel:

2“Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala,
ọ gaghị ebilite ọzọ,
onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya,
ọ dịkwaghị onye ga-ekulite ya.”
3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị Izrel,

“Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike,
ka naanị narị ga-afọdụ,
obodo unu na-ezipụ narị ndị ike
ka naanị iri ga-afọdụrụ.”

Chọsienụ Chineke ike ka unu dị ndụ

4Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel,

“Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ.
5Unu achọla Betel,
unu abanyekwala na Gilgal,
maọbụ ga ije ruo Bịasheba.
Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ,
ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.”
Maọbụ, ajọ ihe

6Chọọnụ Onyenwe anyị, ka unu dịrị ndụ,
ka ọ gharakwa iji ike bịakwasị ụlọ Josef, dịka ire ọkụ,
ọ ga-erepịa ha.
Betel agaghị enwe onye ga-emenyụ.

7Unu ndị na-eme ikpe ziri ezi ka ọ ghọọ ihe ilu,
na-ekpukwa ezi omume ihu nʼala.

8Onye mere kpakpando pleiades na orion,
onye na-emekwa ka oke ọchịchịrị ghọọ ụtụtụ,
na-emekwa ka ụbọchị ghọọ abalị,
onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,
wụsa ha nʼelu ala akọrọ,
Onyenwe anyị bụ aha ya.
9Onye na-eme ka ịla nʼiyi bịakwasị ndị dị ike nʼotu ntabi anya,
na-emekwa ka ịla nʼiyi bịakwasị ebe ahụ niile e wusiri ike.

10Ọ dị ndị na-akpọ onye na-edebe ikpe ziri ezi nʼụlọikpe asị,
na-elelịkwa onye na-ekwu eziokwu anya.

11Unu na-azọpịa ndị ogbenye,
na-anapụ ha ukwu ọka wiiti ha.
Unu ewuolara onwe unu ụlọ nkume a wara awa,
ma unu agaghị ebi nʼime ha.
Unu akụọla ubi vaịnị mara mma,
ma unu agaghị aṅụ ihe ọṅụṅụ ọbụla sitere nʼime ha.
12Nʼihi na amaara m njehie unu niile, ka ha si baa ụba,
matakwa ọtụtụ mmehie unu niile.

Unu na-emegbu ndị ezi omume, na-erikwa ngarị.
Ma na-achụpụkwa ndị ọ dịghị nke ha nwere nʼọnụ ụzọ ama.
13Nʼihi ya, onye nwere uche na-ekpuchi ọnụ ya nʼoge ahụ,
nʼihi na oge ndị ahụ dị njọ.

14Chọsienụ ezi ihe ike, ọ bụghị ihe ọjọọ;
ka unu dịrị ndụ.
Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọnyere unu,
dịka unu si kwuo.
15Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, ma hụnụ ezi ihe nʼanya.
Meenụ ka ikpe ziri ezi guzosie ike nʼụlọikpe unu.
O nwere ike bụrụ na Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile
ga-enwe amara nʼahụ ndị fọdụụrụ Josef.
16Nʼihi ya, nke a ka Onyenwe anyị, Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Onyenwe anyị na-asị,

“Oke iti mkpu akwa aghaghị ịdị nʼokporoụzọ niile;
ọ bụkwa nʼama niile ka ha ga-asị, azịgbakwa, azịgbakwa.
A ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha bịa kwaa akwa,
kpọọkwa ndị na-eru ụjụ ka ha bịa tie mkpu akwa.
17A ga-enwe iti mkpu akwa nʼime ubi vaịnị niile,
nʼihi na aga m esi nʼetiti unu gafee,”
ka Onyenwe anyị kwuru.

Ụbọchị Onyenwe anyị

18Ahụhụ dịrị unu,
Maọbụ, Azịgba unu

ndị ahụ na-achọsi ụbọchị Onyenwe anyị ike.
Gịnị mere unu ji achọ ụbọchị nke Onyenwe anyị ahụ?
Ụbọchị ahụ ga-abụ ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè.
19Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ
ma zute anụ ọhịa bịa,
maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike
ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ,
agwọ ataa ya.
20Ụbọchị Onyenwe anyị ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè,
nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya?

21“Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya.
Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ.
22A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu,
agaghị m anabata ha.
Aja udo nke anụ unu gbara abụba
abụrụghị m ihe ọbụla.
23Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu.
Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu.
24Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri,
ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.

25“Iri afọ anọ ndị ahụ unu nọ nʼọzara,
unu chụụrụ m aja, unu o wetara m onyinye, unu ụlọ Izrel?
26Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu,
na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu,
bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ,
nke unu kpụrụ nye onwe unu.
27Ya mere, aghaghị m ime ka e buru unu gaa nʼala ndị ọzọ, nʼofe Damaskọs,”
ka Onyenwe anyị, Onye ahụ aha ya bụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Copyright information for IboBIU